Ilu 7:14-21 Bible Nso (IGBOB)

14. Ihe àjà nile nke àjà-udo di n'akam;Ta ka m'kwughachiworo ihe nile m'kwere na nkwa.

15. N'ihi nka ka m'putara izute gi,Ichọsi iru-gi ike, m'we chọputa gi.

16. Ákwà-nb͕abá mara nma ka m'b͕abáworo n'ihe m'ji edina,Bú ákwà turu agwa nke ogho Ijipt.

17. Ewerewom myrrh na aloes na cinnamonFesa ihe-ndinam.

18. Bia, ka afọ jubiga ayi ókè n'ikwa-iko rue ututu;Ka ayi me ka obi tọ ayi utọ n'ihu-n'anya nile.

19. N'ihi na dim anọghi n'ulo,O jewo ije di anya:

20. Ọ werewo akpa ego n'aka-ya;N'ubọchi ọnwa-ndọzu ka ọ gālata.

21. O were ọtutu urà-ya wezuga nwa-okorọbia ahu ka ọ ba n'ulo-ya,O were okwu ire-utọ nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya nufue ya.

Ilu 7