Ilu 24:11-24 Bible Nso (IGBOB)

11. Naputa ndi anāchigara ọnwu,Ndi ahu kwa anēwezuga n'ọnọdu-ha nye n'ob͕ub͕u, gi lezie anya ka i b͕ochie ha.

12. Mb͕e i si, Le, ayi amaghi ihe a:Onye nātùzi obi nile, Ònye ahu adighi-aghọta?Onye nēche kwa nkpuru-obi-gi nche, Ònye ahu adighi-ama?Ọ̀ gaghi-enyeghachi kwa madu dika ọlu-ya si di?

13. Nwam, racha manu-aṅu, n'ihi na ọ di nma;Ya na manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi, nke nātọ okpo-ọnu-gi utọ:

14. Mara na otù a ka amam-ihe diri nkpuru-obi-gi:Ọ buru na i chọtawo ya, ọdi-n'iru gādi kwa, Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.

15. Gi onye nēmebi iwu, echela anwu imegide ebe-obibi onye ezi omume;Apunarala ya ebe-izu-ike-ya:

16. N'ihi na ub͕ò asa ka onye ezi omume nāda, bili kwa ọzọ:Ma ndi nēmebi iwu nāsu ngọngọ n'ihe ọjọ.

17. Aṅurila mb͕e onye-iro-gi nāda,Ka obi-gi ghara kwa iteghari egwú ọṅù mb͕e ọ nāsu ngọngọ:

18. Ka Jehova we ghara ihu ya, o we jọ njọ n'anya-Ya,O we me ka iwe-Ya si n'aru ya laghachi.

19. Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ;Ekwosola ndi nēmebi iwu ekworo.

20. N'ihi na ọdi-n'iru agaghi-adiri onye ọjọ;Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.

21. Nwam, tua egwu Jehova na eze:Agwakọtala onwe-gi na ndi nēnwo enwo:

22. N'ihi na ọ bu na mberede ka nhuju-anya-ha gēbili;Ọdida nke ha abua kwa, ònye mara ya?

23. Ndia bu kwa okwu nke ndi mara ihe.Imata iru madu n'ikpé adighi nma.

24. Onye nāsi onye nēmebi iwu, Onye ezi omume ka i bu;Ndi nile di iche iche gākpọlu ya, mba nile gēwesa ya iwe:

Ilu 24