10. Ọ buru na i di ume-ngwu n'ubọchi ahuhu,Ike-gi pere npe.
11. Naputa ndi anāchigara ọnwu,Ndi ahu kwa anēwezuga n'ọnọdu-ha nye n'ob͕ub͕u, gi lezie anya ka i b͕ochie ha.
12. Mb͕e i si, Le, ayi amaghi ihe a:Onye nātùzi obi nile, Ònye ahu adighi-aghọta?Onye nēche kwa nkpuru-obi-gi nche, Ònye ahu adighi-ama?Ọ̀ gaghi-enyeghachi kwa madu dika ọlu-ya si di?
13. Nwam, racha manu-aṅu, n'ihi na ọ di nma;Ya na manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi, nke nātọ okpo-ọnu-gi utọ:
14. Mara na otù a ka amam-ihe diri nkpuru-obi-gi:Ọ buru na i chọtawo ya, ọdi-n'iru gādi kwa, Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.
15. Gi onye nēmebi iwu, echela anwu imegide ebe-obibi onye ezi omume;Apunarala ya ebe-izu-ike-ya:
16. N'ihi na ub͕ò asa ka onye ezi omume nāda, bili kwa ọzọ:Ma ndi nēmebi iwu nāsu ngọngọ n'ihe ọjọ.
17. Aṅurila mb͕e onye-iro-gi nāda,Ka obi-gi ghara kwa iteghari egwú ọṅù mb͕e ọ nāsu ngọngọ:
18. Ka Jehova we ghara ihu ya, o we jọ njọ n'anya-Ya,O we me ka iwe-Ya si n'aru ya laghachi.
19. Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ;Ekwosola ndi nēmebi iwu ekworo.
20. N'ihi na ọdi-n'iru agaghi-adiri onye ọjọ;Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.
21. Nwam, tua egwu Jehova na eze:Agwakọtala onwe-gi na ndi nēnwo enwo:
22. N'ihi na ọ bu na mberede ka nhuju-anya-ha gēbili;Ọdida nke ha abua kwa, ònye mara ya?