Ilu 24:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Ekwosola ndi ọjọ ekworo,Achọsi-kwa-la ike inọ n'etiti ha:

2. N'ihi na ipunara-madu-ihe ka obi-ha nātughari,Okwu nmeb͕u ka eb͕ub͕ere-ọnu-ha nēkwu.

3. Amam-ihe ka eji ewu ulo;Ọ bu kwa nghọta ka eji eme ka o guzosie ike:

4. Site kwa n'ihe-ọmuma ka ime-ulo-ya nile nējuputaN'àkù nile di oké ọnu-ahia di kwa utọ.

5. Onye mara ihe di ike;E, onye nwere ihe-ọmuma nēme ka ike nwe ume.

6. N'ihi na ezi ndum-ọdu ka i gēji eburu onwe-gi agha:Ọzọ, nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu.

7. Amam-ihe adikara onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ elu:Ọ dighi-asaghe ọnu-ya n'ọnu-uzọ-ama.

8. Onye nēchè ime ihe ọjọ,Ya ka agākpọ onye-nwe nzube ọjọ nile.

9. Nzube nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ bu nmehie:Ọzọ, ihe-árú n'anya madu ka onye nke nākwa emò bu.

10. Ọ buru na i di ume-ngwu n'ubọchi ahuhu,Ike-gi pere npe.

11. Naputa ndi anāchigara ọnwu,Ndi ahu kwa anēwezuga n'ọnọdu-ha nye n'ob͕ub͕u, gi lezie anya ka i b͕ochie ha.

12. Mb͕e i si, Le, ayi amaghi ihe a:Onye nātùzi obi nile, Ònye ahu adighi-aghọta?Onye nēche kwa nkpuru-obi-gi nche, Ònye ahu adighi-ama?Ọ̀ gaghi-enyeghachi kwa madu dika ọlu-ya si di?

13. Nwam, racha manu-aṅu, n'ihi na ọ di nma;Ya na manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi, nke nātọ okpo-ọnu-gi utọ:

Ilu 24