6. Ọnu-ya nākpọ kwa iti-ihe òkù.
7. Ọnu onye-nzuzu buru ya nbibi,Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu kwa ọnyà nkpuru-obi-ya.
8. Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri nātọ utọ nke-uku,Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ.
9. Ọzọ, onye di ume-ngwu n'ije-ozi-ya,Onye ahu bu nwa-nne nke onye-nwe nbibi.