Ilu 18:4-8 Bible Nso (IGBOB)

4. Miri nke miri emi ka okwu nile nke ọnu madu bu;Iyi nērù erù ka isi-iyi amam-ihe bu.

5. Ihu onye nēmebi iwu iru-ọma adighi nma,Iwezuga onye ezi omume n'ikpé.Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye-nzuzu nābà n'ilu-ọ̀gù,

6. Ọnu-ya nākpọ kwa iti-ihe òkù.

7. Ọnu onye-nzuzu buru ya nbibi,Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu kwa ọnyà nkpuru-obi-ya.

8. Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri nātọ utọ nke-uku,Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ.

Ilu 18