Ilu 18:10-16 Bible Nso (IGBOB)

10. Ulo-elu di ike ka aha Jehova bu:Nime ya ka onye ezi omume nāb͕abà, o we nọ n'elu.

11. Àkù ọgaranya bu obodo-ya siri ike,Ọ di kwa ka mb͕idi di elu nime ntughari-obi-ya nile.

12. N'iru ntipia ka obi madu di elu,Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.

13. Onye nāzaghachi okwu tutu ọ nu,Uche b͕agaọrọ ab͕agọ na ọnọdu-ihere ka ọ buru ya.

14. Mọ madu gānagide ọria-ya;Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u, ònye gēburu ya?

15. Obi onye-nghọta nēnweta ihe-ọmuma;Ọzọ, nti ndi mara ihe nāchọ ihe-ọmuma.

16. Onyinye madu nākwara ya uzọ sara mbara,Ọ bu kwa n'iru ndi uku ka o nēdu ya je.

Ilu 18