1. O we me ka m'laghachi n'uzọ ọnu-uzọ-ama nke ebe nsọ ahu nke di n'èzí, nke nēche iru n'Iru-anyanwu; ma ọnu-uzọ-ama ahu bu nke emechiri emechi.
2. Jehova we sim, Ọnu-uzọ nka gābu ihe emechiri emechi, agaghi-emeghe ya, ọ dighi kwa onye ọ bula gēsi ya bata, n'ihi na Jehova, bú Chineke nke Israel, esiwo ya bata; o we buru ihe emechiri emechi.
3. Ma onye-isi-unu, dika onye-isi ka ya onwe-ya gānọdu ala nime ya iri nri n'iru Jehova; ọ gēsi uzọ nke uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama nka bata, si kwa uzọ-ya pua.
4. O we me ka m'bia n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu n'iru ulo ahu; m'we hu, ma le, ebube Jehova juputara ulo Jehova: m'we da kpuchie irum n'ala.
5. Jehova we sim, Nwa nke madu, tukwasi obi-gi, were anya-gi abua hu, were nti-gi abua nu ihe ahu nile nke Mu onwem nāgwa gi bayere ukpuru nile nke ulo Jehova, baye-kwa-ra iwu-ya nile; tukwasi kwa obi-gi na nbata ulo a, ya na ọpupu nile nke ebe nsọ a.
6. I gāsi kwa ndi nānupu isi, bú ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: O zuwo unu, site n'ihe-árú nile unu,
7. ebe unu meworo ka ndi ala ọzọ bata, bú ndi anēbighi úgwù n'obi anēbighi kwa úgwù n'anu-aru, inọ n'ebe nsọm, ime ka ọ ghara idi nsọ, bú ulom, mb͕e unu nēweta nrim nso, bú abuba na ọbara, ha we mebie ọb͕ub͕a-ndum, tiyere ihe-árú nile unu.
8. Unu edebeghi kwa ihe-ndebe nke ihe nsọm nile: unu we do ha ndi nēdebe ihe-ndebem n'ebe nsọm nye onwe-unu.
9. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ dighi onye ala ọzọ, nke anēbighi úgwù n'obi nke anēbighi kwa úgwù n'anu-aru, gābata n'ebe nsọm, bú onye ala ọzọ ọ bula nke di n'etiti umu Israel.