Ezikiel 40:5-14 Bible Nso (IGBOB)

5. Ma le, otù mb͕idi di n'èzí ulo ahu buruburu n'akuku nile, n'aka nwoke ahu ka amì eji atù ihe di kwa nke di cubit isi n'ogologo, cubit ọ bula bu otù cubit na otù ntù-ọbu-aka: o we tùa ib͕idi nke mb͕idi ahu anēwu ewu, otù ami; na idi-elu-ya, otù ami.

6. O we biarue ọnu-uzọ-ama nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu, ọ rigo ihe-nrigo-ya, tùa nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu, otù ami n'obosara: ọbuná otù nbata-uzọ, otù ami n'obosara.

7. Ime-ulo ọ bula bu otù ami n'ogologo, na otù ami n'obosara; n'etiti ime-ulo abua di cubit ise; nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama n'akuku uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n'ulo bu otù ami.

8. O we tùa uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n'ulo, otù ami.

9. O we tùa uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama, cubit asatọ; na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, cubit abua; uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n'ulo.

10. Ime-ulo nke ọnu-uzọ-ama n'uzọ Iru-anyanwu di atọ n'otù akuku, atọ n'akuku nke-ọzọ; otù ọtùtù ka ha atọ nwere: ọ bu kwa otù ọtùtù ka akuku-ọnu-uzọ abua nwere n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ.

11. O we tùa obosara nke oghere ọnu-uzọ-ama, cubit iri; na ogologo nke ọnu-uzọ-ama, cubit iri-na-atọ;

12. na ókè-ala n'iru ime-ulo nile, otù cubit n'otù akuku, na ókè-ala, otù cubit n'akuku nke-ọzọ; na ime-ulo onwe-ya, cubit isi n'otù akuku na cubit isi n'akuku nke-ọzọ.

13. O we tùa ọnu-uzọ-ama site n'elu-ulo nke otù ime-ulo rue elu-ulo nke ime-ulo-ibe-ya, obosara-ya di orù cubit na ise; oghere na ncherita-iru oghere.

14. O we me akuku-ọnu-uzọ, ọgu cubit atọ; ọbuná rue akuku-ọnu-uzọ nke ogige, ọnu-uzọ-ama di buruburu n'akuku nile.

Ezikiel 40