Ezikiel 40:3-16 Bible Nso (IGBOB)

3. O we me ka m'bia n'ebe ahu, ma le, otù nwoke, ma ele ya anya ọ di ka ọla si di n'ile ya anya, eriri flax di kwa n'aka-ya, ya na amì eji atù ihe; onye ahu nēguzo kwa n'ọnu-uzọ-ama.

4. Nwoke ahu we gwam okwu, si, Nwa nke madu, were anya-gi abua hu, were kwa nti-gi abua nu, tukwasi kwa obi-gi n'ihe nile Mu onwem nēme ka i hu; n'ihi na ọ bu ime ka i hu ha ka emeworo ka i bia ebe a: gosi ulo Israel ihe nile nke gi onwe-gi nāhu.

5. Ma le, otù mb͕idi di n'èzí ulo ahu buruburu n'akuku nile, n'aka nwoke ahu ka amì eji atù ihe di kwa nke di cubit isi n'ogologo, cubit ọ bula bu otù cubit na otù ntù-ọbu-aka: o we tùa ib͕idi nke mb͕idi ahu anēwu ewu, otù ami; na idi-elu-ya, otù ami.

6. O we biarue ọnu-uzọ-ama nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu, ọ rigo ihe-nrigo-ya, tùa nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu, otù ami n'obosara: ọbuná otù nbata-uzọ, otù ami n'obosara.

7. Ime-ulo ọ bula bu otù ami n'ogologo, na otù ami n'obosara; n'etiti ime-ulo abua di cubit ise; nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama n'akuku uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n'ulo bu otù ami.

8. O we tùa uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n'ulo, otù ami.

9. O we tùa uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama, cubit asatọ; na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, cubit abua; uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n'ulo.

10. Ime-ulo nke ọnu-uzọ-ama n'uzọ Iru-anyanwu di atọ n'otù akuku, atọ n'akuku nke-ọzọ; otù ọtùtù ka ha atọ nwere: ọ bu kwa otù ọtùtù ka akuku-ọnu-uzọ abua nwere n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ.

11. O we tùa obosara nke oghere ọnu-uzọ-ama, cubit iri; na ogologo nke ọnu-uzọ-ama, cubit iri-na-atọ;

12. na ókè-ala n'iru ime-ulo nile, otù cubit n'otù akuku, na ókè-ala, otù cubit n'akuku nke-ọzọ; na ime-ulo onwe-ya, cubit isi n'otù akuku na cubit isi n'akuku nke-ọzọ.

13. O we tùa ọnu-uzọ-ama site n'elu-ulo nke otù ime-ulo rue elu-ulo nke ime-ulo-ibe-ya, obosara-ya di orù cubit na ise; oghere na ncherita-iru oghere.

14. O we me akuku-ọnu-uzọ, ọgu cubit atọ; ọbuná rue akuku-ọnu-uzọ nke ogige, ọnu-uzọ-ama di buruburu n'akuku nile.

15. Ọzọ, site n'iru ọnu-uzọ-ama, na nbata, rue iru uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama di nime di ọgu cubit abua na iri.

16. Ọzọ, window emechiri emechi diri ime-ulo nile, di-kwa-ra akuku-ọnu-uzọ nile ha n'ime ọnu-uzọ-ama buruburu n'akuku nile, otú a ka window di-kwa-ra ulo-nbata nile: window di kwa n'ime ulo buruburu n'akuku nile: nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ ọ bula.

Ezikiel 40