Ezikiel 31:11-15 Bible Nso (IGBOB)

11. M'gēnye kwa ya n'aka onye di ike nke mba nile; ọ ghaghi imeso ya: n'ihi nmebi-iwu-ya ka M'chupuworo ya.

12. Ndi ala ọzọ, bú ndi kariri mba nile n'ime ka madu ma jijiji, we bipu ya, tusa ya: n'elu ugwu nile na nime ndagwurugwu nile ka alaka-ya daworo, ewe nyajie alaka-ya nile nke akwukwọ-ha kpuchiri ha n'ebe nile miri si erù nke ala-ya; ndi nile nke ala ahu esiwo kwa na ǹdò-ya rida, ha we tusa ya.

13. N'elu ihe-ya dara ada ka anu-ufe nile nke elu-igwe gēbi, ọ bu kwa n'alaka-ya nile ka anu ọhia nile gādi:

14. ka osisi nile nke miri we ghara idi elu n'ogologo-ha, ghara kwa itiye ọnu-ọnu-ha rue etiti alaka b͕ara ọhia, ka ndi-ha ndi di ike we ghara iguzo n'idi-elu-ha, bú ndi nile nāṅu miri: n'ihi na ha nile ka ewereworo nye ọnwu, ijeru ala di n'okpuru uwa, n'etiti umu nke madu, ijekuru ndi nārida n'olùlù.

15. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ubọchi mb͕e ọ ridaruru n'ala-mọ emerem ka erue újú: ekpuchirim ob͕u-miri n'ihi ya, eb͕ochi-kwa-ram osimiri-ya nile, ewe b͕ochibido ọtutu miri: eme-kwa-ram ka Lebanon yiere ya uwe-nkpe, osisi nile nke ọhia tubọ-kwa-ra atubọ n'ihi ya.

Ezikiel 31