Emos 3:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Nurunu okwu a nke Jehova kwuworo megide unu, umu Israel, megide ab͕uru ahu nile nke M'mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, si,

2. Nání unu ka M'maworo n'etiti ab͕uru nile nke uwa: n'ihi nka ka M'gēji ajọ omume nile unu leta unu.

3. Màdu abua gāyikọta je ije, ma ọ buru na ha ezuteghi?

4. Ọdum, ọ̀ gāb͕ọ uja n'oké ọhia, mb͕e ọ dighi anu ọ nādọb͕u? nwa-ọdum, ọ̀ gēme ka olu-ya si n'ebe-obibi-ya da, ma ọ buru na o nwudeghi ihe?

5. Nnunu, ọ̀ gādabà n'ib͕udu di n'ala, ebe ọ nādighi ọnyà esiri ya? ib͕udu, ò gēsi n'ala kpọhiepu, ma o jideghi ihe ọ bula?

6. Àgāfù opì-ike n'obodo, ndi-ya aghara ima jijiji? ihe ọjọ, ọ̀ gādi n'obodo, ma Jehova emeghi ya?

7. N'ezie Onye-nwe-ayi Jehova agaghi-eme ihe, ma ọ buru na O kpugheghi ìzù nzuzo Ya nye ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma-Ya.

Emos 3