2. Ekwurum okwu bayere ichì-ọchì, si, Ọ nāwi ara: m'kwu-kwa-ra okwu bayere ọṅù, si, Gini kwa ka ọ nēme?
3. Eledorom n'obim iji manya-vine me ka obi tọ anu-arum utọ, (ma obim nēdum n'amam-ihe), na ijide nzuzu, rue mb͕e m'gāhu ihe ezi ihe ahu bu nke diri umu madu, bú nke ha gēme n'okpuru elu-igwe ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ha.
4. Emerem ka ọlum nile di uku; ewurum onwem ulo di iche iche, kuara onwem ubi-vine di iche iche,
5. mere onwem ubi di iche iche ab͕ara ogige na ogige ọma di iche iche, m'we kua osisi nāmi nkpuru nile di iche iche nime ha:
6. emerem onwem ọdọ-miri, isite na ha de oké ọhia nēpu osisi:
7. ab͕ataram orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, umu-ulo di-kwa-ram; ọtutu ihe-nnweta, bú ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu, di-kwa-ram, kari ndi nile burum uzọ nime Jerusalem:
8. achikọta-kwa-ram nye onwem ọla-ọcha na ọla-edo, na ihe nke aka ndi-eze na ala nile m'nāchi achi: edozi-kwa-ram nye onwem ndi-abù ndikom na ndi-abù ndinyom, na ihe-utọ nile nke umu madu, ndi-iko nwayi bara uba nke-uku.
9. M'we di uku, ba kwa uba kari onye ọ bula nke burum uzọ nime Jerusalem: amam-ihem guzo-kwa-ra n'ebe m'nọ.
10. Ma ihe ọ bula anyam abua riọrọ, anapughm ha ihe ahu: eb͕ochighm obim n'ọǹù ọ bula, n'ihi na obim ṅuriri ọṅu site na ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu; nka bu kwa òkèm nke sitere na ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu.
11. Mu onwem we che ọlum nile nke akam abua luru iru, eche-kwa-ram ndọb͕u nke m'dọb͕uru onwem n'ọlu ime iru: ma, le, ihe nile bu ihe-efu na ichọ ijide ifufe, ọ dighi kwa ihe fọduru madu n'okpuru anyanwu.
12. Mu onwem we che iru ihu amam-ihe, na iwi-ara na nzuzu: n'ihi na gini ka madu nke nēso eze n'azu gēme? ọ bu ihe nke ha meworo na mb͕e di anya gara aga.
13. Mu onwem we hu na amam-ihe kariri nzuzu, dika ìhè si kari ọchichiri.
14. Onye mara ihe, anya-ya abua di n'isi-ya, ma onye-nzuzu nējeghari n'ọchichiri: ma mu onwem amawo kwa na otù ndabà nādabàra ha nile.
15. Mu onwem we si n'obim, Dika o si dabàra onye-nzuzu, otú a ka ọ nādabàram, ọbuná mu onwem; ma n'ìhi gini kwa ka mu onwem mara ihe kari? M'we kwue okwu n'obim, si, na nka bu kwa ihe-efu.