Deuteronomi 32:12-21 Bible Nso (IGBOB)

12. Otú a Jehova, nání Ya, nēdu ya,Ọ dighi kwa chi ala ọzọ diyere ya.

13. Ọ nēme ka ebe di elu nke uwa būru ya dika inyinya,Ọ we rie ihe-ọmume nke ubi;O me-kwa-ra ya ka ọ mia manu-aṅu site na nkume di elu,Na manu site n'oké nkume ọ́mú;

14. Miri-ara nke raru araru nke ìgwè ehi, na miri-ara nke ìgwè ewu na aturu,Ya na abuba umu-aturu,Na ebulu àb͕ọ̀ Beshan, na ewu,Tiyere abuba obi ọka wheat;Ọbara nkpuru-vine ka i nāṅu kwa, bú manya-vine.

15. Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu:I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi:O we rapu Chineke nke mere ya,We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu.

16. Ha nēwere ndi ala ọzọ me ka O kwo ekworo,Ha nēwere ihe-árú di iche iche kpasue Ya iwe.

17. Ha nāchuru ndi-mọ ọjọ aja, ndi nābughi Chineke,Bú chi ha nāmaghi,Ndi ọhu ndi si n'ebe di nso bata,Ndi nna-unu-hà nātughi ujọ.

18. Oké Nkume ahu nke muru gi ka i nēchefu,I chezọwo kwa Chineke nke muputara gi.

19. Jehova we hu ya, we lelia ha anya,N'ihi nkpasu-iwe nke umu-Ya ndikom na umu-Ya ndinyom.

20. O we si, Ka M'zopu irum n'ebe ha nọ,M'gāhu ihe gābu ikpe-azu-ha:N'ihi na ọb͕ọ nke nāb͕akuta azu ka ha bu,Umu ndi nēkwesighi okwukwe.

21. Ha onwe-ha ewerewo ihe nābughi Chineke mem ka M'kwo ekworo;Ha ewerewo ihe-efu nile ha kpasuem iwe:Mu onwem gēwere kwa ndi nābughi ndi me ha ka kwo ekworo;Mba nzuzu ka M'gēwere kpasue ha iwe.

Deuteronomi 32