Deuteronomi 32:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Ṅanu nti, unu elu-igwe, ka m'kwu kwa ihe;Ka uwa nu kwa okwu ọnum:

2. Nmutam gātasi dika miri-ozuzo,Okwu-ọnum ganēruputa dika igirigi;Dika nshansha-miri n'elu ahihia ndu,Di kwa ka oké miri-ozuzo n'elu ihe-ọkukú:

3. N'ihi na aha Jehova ka m'gākpọsa:Nyenu Chineke-ayi idi-uku.

4. Oké nkume ahu, ihe zuru okè ka ọlu-Ya bu:N'ihi na uzọ-Ya nile bu ikpé ziri ezi:Chineke Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke nēnweghi ajọ omume,Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bu.

Deuteronomi 32