Abù Ọma 89:43-51 Bible Nso (IGBOB)

43. Ọzọ, I nēme ka ọnu mma-agha-ya laghachi azu,I meghi kwa ka o guzosie ike n'agha.

44. I mewo ka onwunwu-ọcha-ya kwusi,I tudawo kwa oche-eze-ya rue ala.

45. I bilatawo ubọchi nile ọ bu okorọbia:I werewo ihere kpuchie ya n'aru. Selah

46. Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēzobe onwe-gi ebighi-ebi?Rùe ole mb͕e ka ọnuma-Gi ganēre dika ọku?

47. Cheta otú mb͕e ndu mu onwem di nkpunkpu:Ọ̀ bu ihe-efu gini ka I kèworo umu madu nile nye?

48. Òle nwoke ọ bu nke gādi ndu, ghara ihu ọnwu anya,Nke gēme ka nkpuru-obi-ya wepuga onwe-ya n'aka ala-mọ? Selah

49. Òle ebe ebere, mbu Gi nile di. Onye-nwe-ayi,Nke I ṅuru Devid iyi bayere ha n'ikwesi-ntukwasi-obi-Gi?

50. Onye-nwe-ayi, cheta ita-uta ndi-orù-Gi;Eburuwom n'obim ita-uta nke ndi nile di iche iche bara uba;

51. Nke ndi-iro-Gi jiworo ta uta, Jehova,Nke ha jiworo ta nzọ-ukwu nile nke onye-Gi etere manu uta.

Abù Ọma 89