Abù Ọma 8:3-8 Bible Nso (IGBOB)

3. Mb͕e m'huru elu-igwe-Gi, bú ọlu nkpisi-aka-Gi,Ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo;

4. Gini ka madu bu, na I nēcheta ya;Na nwa nke madu, na I nēleta ya?

5. I we me ya ka ọ fọduru ya nke-ntà ibu Chineke,I ji kwa nsọpuru na ima-nma kpube ya n'isi dika okpu-eze.

6. I nēme ya ka ọ nāchi ọlu nile nke aka-Gi abua;Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua:

7. Ewu na aturu na ehi, ha nile,Ha na anu ọhia;

8. Nnunu elu-igwe, na azù nile nke oké osimiri,Bú ihe nke nāgabiga n'uzọ nile nke oké osimiri nile.

Abù Ọma 8