Abù Ọma 78:5-16 Bible Nso (IGBOB)

5. O we me ka otù ihe-àmà guzosie ike nime Jekob,O do-kwa-ra iwu n'Israel,Nke O nyere nna-ayi-hà n'iwu,Ime ka umu-ha mara ha:

6. Ka ọb͕ọ nke gādi n'iru we mara, bú umu agāmu;Ha gēbili, we kọro umu-ha akukọ ahu:

7. Ka ha we tukwasi obi-ha na Chineke,Ghara ichezọ omume nile nke Chineke,Ma debe ihe nile O nyere n'iwu:

8. Ghara kwa idi ka ndi bu nna-ha,Ndi bu ọb͕ọ nēwezuga onwe-ha nke nānupu kwa isi;Ọb͕ọ ndi nēdozighi obi-ha,Ndi mọ-ha nēkwesighi ntukwasi-obi n'ebe Chineke nọ.

9. Umu Efraim, ọ bu ezie na ha nāchi ihe-agha nēbuli kwa uta,Ma ha chighariri n'ubọchi agha.

10. Ha edebeghi ọb͕ub͕a-ndu Chineke,Ma ha juru ijeghari n'iwu-Ya;

11. Ha we chezọ omume-Ya nile,Na oké ọlu-Ya nile nke O mere ka ha hu.

12. N'iru ndi bu nna-ha ka Ọ luru oké ọlu,N'ala Ijipt, n'ọhia Zoan.

13. O kewara oké osimiri, we me ka ha gabiga;O me-kwa-ra ka miri guzo ọtọ dika obo-ihe.

14. O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n'ehihie,Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile.

15. Ọ nākpọwa oké nkume di iche iche n'ọzara,We me ka ha ṅua miri ri nne dika o si nime ob͕u-miri puta.

16. O me-kwa-ra ka miri nke nērù erù si na nkume di elu puta,O we me ka miri nērùda dika ọtutu osimiri.

Abù Ọma 78