1. Chineke, n'ìhi gini ka I juworo ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi?N'ìhi gini ka iwe Gi nākwu anwuru imegide ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-Gi?
2. Cheta nzukọ-Gi, nke I nwetaworo na mb͕e ochie,Nke I b͕aputaworo ibu ebo nke ihe-nketa-Gi;Cheta ugwu Zaion, ebe I biworo.
3. Zọlie ije ngwa ngwa ibiaru ebe nile etikpọrọ ebighi-ebi;Onye-iro emewo ihe ọjọ nile n'ebe nsọ.
4. Ndi nākpab͕u Gi ab͕ọwo uja n'etiti ebe-nzute-Gi;Ha edowo ihe-iriba-ama nile ha ibu ihe-iriba-ama,
5. Amara ha dika onye nēbuli anyu-ike elu nke-ukuN'alùghi-ulù nke osisi.