1. Ka Chineke bilie, ka ndi-iro-Ya b͕asa;Ka ndi nākpọ Ya asì si n'iru Ya b͕alaga.
2. Dika ifufe si efesa anwuru-ọku, otú a ka I gēfesa ha:Dika wax si ab͕azepu n'iru ọku,Otú a ka ndi nēmebi iwu gēsi n'iru Chineke la n'iyì.
3. Ma ka ndi ezi omume ṅuria; ka obi tọ ha utọ n'iru Chineke:E, ka ha wulie elu n'ọṅù.
4. Bùkuenu Chineke abù, bùkuenu aha-Ya abù ọma:Tulierenu Ya uzọ, bú Onye nānọkwasi inyinya gabiga n'ala ihe nādighi;Aha-Ya bu JA; ṅuri-kwa-nu ọṅu-agha n'iru Ya.
5. Nna nke umu-nb͕ei, na onye-ikpe nke ndinyom di-ha nwuru,Ka Chineke bu n'ebe-obibi-Ya di nsọ.
6. Chineke nēme ndi nání ha nọ ka ha biri n'ulo:Ọ nēme ka ndi-nkpọrọ puta ba n'ebe ihe nāgara ha nke-ọma:Ma ndi nēwezuga onwe-ha bi n'ala kpọrọ nku.
7. Chineke, mb͕e I putara ga n'iru ndi-Gi,Mb͕e I zọbigara ije n'ala tọb͕ọrọ n'efu; Selah
8. Ala mara jijiji,Ọzọ, elu-igwe buru miri n'iru Chineke:Sainai ahu mara jijiji n'iru Chineke, bú Chineke nke Israel.