Abù Ọma 66:9-14 Bible Nso (IGBOB)

9. Onye na-etinye nkpuru-obi-ayi nime ndu,Ọ kweghi kwa ka ewezuga ukwu-ayi n'ọnọdu-ha.

10. N'ihi na I nwawo ayi, Chineke:I nuchawo ayi, dika esi anucha ọla-ọcha.

11. I mere ka ayi ma n'ọnyà;I tukwasiwo n'úkwù-ayi ibu nānyib͕u ayi.

12. I mewo ka madu rikwasi inyinya gabiga n'elu isi-ayi;Ayi bàra n'ọku na nime miri;I we me ka ayi puta ba n'inwebiga-ihe-ókè.

13. M'gēji ọtutu àjà-nsure-ọku ba n'ulo-Gi,M'gākwughachi Gi nkwam nile m'kwere Gi,

14. Nke eb͕ub͕ere-ọnum abua ji saghepu,Nke ọnum kwu-kwa-ra, mb͕e nkpà dirim.

Abù Ọma 66