Abù Ọma 59:13-15 Bible Nso (IGBOB)

13. Me ka ha gwusia n'ọnuma-Gi, me ka ha gwusia, ka ha ghara idi ọzọ:Ka ha mara kwa na Chineke nāchi achi nime Jekob,Rue nsọtu nile nke uwa. Selah

14. Ha nālaghachi kwa n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita,Nāga obodo buruburu.

15. Ndi ahu nāṅaghari iri ihe,Ọ buru na afọ ejughi ha ha gānọ kwa ọnọdu-abali.

Abù Ọma 59