Abù Ọma 58:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ̀ bu ezie na ezi omume nke kwesiri ka unu kwue bu ob͕i?Ùnu ji izi-ezi kpe ikpe, unu umu madu?

2. É-è, kama ọ bu nime obi ka unu nēme ajọ omume nile;Unu nātùzi ihe-ike nke aka-unu n'uwa.

3. Emewo ka ndi nēmebi iwu buru ndi ala ọzọ site n'àkpà-nwa:Ha akpafuwo site n'afọ nne-ha, nēkwu okwu-ugha.

4. Edide ha nwere yiri edide agwọ:Ha di ka aju-ala nke nti chiri nke nākpọchi nti-ya;

5. Nke nādighi-ege nti olu nke ndi nārà agwọ,Ma-ọbu nke dibia nārafu arafu, bú onye emeworo ka ọ mara ihe.

Abù Ọma 58