Abù Ọma 44:17-21 Bible Nso (IGBOB)

17. Ihe nile a abiakwasiwo ayi; ma ayi echezọghi Gi,Ayi ekwughi kwa okwu-ugha n'ọb͕ub͕a-ndu-Gi

18. Obi-ayi alaghachighi azu,Nzọ-ukwu-ayi esighi kwa n'uzọ-Gi wezuga onwe-ha;

19. Na I gwepiawo ayi n'ọnọdu nkita-ọhia,Were kwa onyinyo ọnwu kpuchie ayi.

20. Ọ buru na ayi echezọwo aha Chineke-ayi,We b͕asapuru chi ala ọzọ ọbu-aka-ayi;

21. Chìneke agaghi-egwuputa ala ihe a?N'ihi na Ya onwe-ya mara ihe-nzuzo nile nke obi.

Abù Ọma 44