Abù Ọma 37:4-15 Bible Nso (IGBOB)

4. Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ;Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ.

5. Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru;Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya.

6. Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè,Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie.

7. Nọ dū n'iru Jehova, were kwa ntachi-obi nēchere Ya:Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi onye ọ nāgara nke-ọme n'uzọ ya,N'ihi madu nke na-eme ajọ ihe-nzube di iche iche.

8. Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma:Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n'ime ihe ọjọ.

9. N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ:Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala.

10. Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa:I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ.

11. Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala;Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ.

12. Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume,Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé.

13. Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì:N'ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia

14. Ndi nēmebi iwu amiputawo mma-agha, zọ kwa uta-ha ukwu ikwe ya;Ime ka onye ewedara n'ala na ob͕eye da,Ib͕u ndi ziri ezi n'uzọ-ha:

15. Mma-agha-ha gābà n'obi onwe-ha,Agāb͕aji kwa uta-ha.

Abù Ọma 37