19. Ihere agaghi-eme ha na mb͕e ihe ọjọ:Afọ gēju kwa ha n'ubọchi oké unwu.
20. N'ihi na ndi nēmebi iwu gāla n'iyì,Ndi-iro Jehova gādi ka ihe di oké ọnu-ahia nke umu-aturu:Ha gēdè; n'anwuru-ọku ka ha gēdè.
21. Onye nēmebi iwu nēbiri ihe, ma ọ dighi-akwughachi:Ma onye ezi omume nēme amara, nēnye kwa enye.
22. N'ihi na ndi Ọ nāgọzi gēnweta ala;Ma agēbipu ndi Ọ nākọcha.
23. Site n'aka Jehova ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike;Uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ.
24. Mb͕e ọ gada, agaghi-atudasi ya:N'ihi na Jehova nākwagide aka-ya.
25. Nwata ka m'buworo, aghọwokwam okenye;Ma ahughm onye ezi omume ka arapuru ya,Ahughkwam nkpuru-ya ka ha nāriọ nri.
26. Ogologo ubọchi nile ka ọ nēme amara, nēbinye kwa ihe;Nkpuru-ya bu kwa ndi agọziri agọzi.
27. Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe;Biri kwa rue mb͕e ebighi-ebi.
28. N'ihi na Jehova nāhu ezi ikpé n'anya,Ọ dighi-arapu kwa ndi-ebere-Ya;Rue mb͕e ebighi-ebi ka anēdebe ha:Ma agēbipu nkpuru ndi nēmebi iwu.