Abù Ọma 35:1-17 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, luso ha ọ̀gù, bú ndi nālusom ọ̀gù:Buso ha agha, bú ndi nēbusom agha.

2. Jide ọta na ọta uku,Bilie iyerem aka.

3. Seputa kwa ube na anyu-ike-agha izute ndi nāchum:Si nkpuru-obim, Nzọputa-gi ka M'bu.

4. Ka ihere me ha, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, bú ndi nāchọsi nkpuru-obim ike:Ka ha b͕aghachi azu nwe iru-ihere, bú ndi nēchè ihe ọjọ ha gēmem.

5. Ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka n'iru ifufe,Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nēnupu ha.

6. Ka uzọ-ha b͕a ọchichiri, ka ọ buru kwa ebe nālo nālọ,Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nāchu ha.

7. N'ihi na ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha zoberem olùlù nke ub͕u-ha,Ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha gwuru olùlù nye nkpuru-obim.

8. Ka ntikpọ biakwasi ya mb͕e ọ nāmaghi;Ọzọ, ka ub͕u-ya nke o zobeworo jide ya onwe-ya:Nime ntikpọ ahu, ya dabà nime ya.

9. Nkpuru-obim gēteghari kwa egwú ọṅù na Jehova:Obi gātọ ya utọ na nzọputa-Ya.

10. Ọkpukpum nile gāsi, Jehova, ònye di ka Gi?Gi Onye nānaputa onye ewedara n'ala n'aka onye di ike kari ya,I nānaputa onye ewedara n'ala na ob͕eye n'aka onye nānapu ya ihe n'ike.

11. Ndi-àmà nke ihe-ike nēbili;Ihe nke m'nāmaghi ka ha nājum.

12. Ha nākwughachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Nkpuru-obim di ka onye b͕a aka nwa.

13. Ma mu onwem, mb͕e ha nāri ọria, uwem bu ákwà-nkpe:Ewedaram nkpuru-obim n'ala site n'obubu-ọnu;Ekperem nālaghachikute kwa obim.

14. Dika agasi na ọ burum eyì, dika agāsi na ọ burum nwa-nne, otú a ka m'jeghariri:Dika onye nēru újú nne-ya, otú a ka m'rudara n'ala nēyi uwe-nkpe.

15. Ma mb͕e m'nāru ukwu ha ṅuriri ọṅu, chikọta onwe-ha:Ha chikọtara onwe-ha imegidem, nētib͕um mb͕e m'nāmaghi;Ha dọkaram, ha eguzoghi kwa du:

16. Dika ndi emeruru emeru n'etiti ndi nāchì ọchì n'ihi ob͕e-achicha,Otú a ka ha takwasirim ikekere-ezé.

17. Onye-nwe-ayi, #mb͕e ole ka I ganēle anya?Si na ntikpọ nile ha weghachi nkpuru-obim,Si n'aka umu-ọdum weghachi nkpuru-obi m'nwere nání ya.

Abù Ọma 35