Abù Ọma 34:7-14 Bible Nso (IGBOB)

7. Mọ-ozi nke Jehova nāma ulo-ikwū-ya buruburu ndi nātu egwu Ya,Ọ we dọputa ha.

8. Detunu ire, hu na Jehova di nma:Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke nāb͕abà nime Ya.

9. Tuanu egwu Jehova, unu ndi nsọ Ya:N'ihi na ọ dighi ihe nākọ ndi nātu egwu Ya.

10. Nkpà akpawo umu-ọdum, agu aguwo kwa ha:Ma ndi nāchọ Jehova, ọ dighi ezi ihe ọ bula gākọ ha.

11. Bianu, umum, gem nti:Egwu Jehova ka m'gēzi unu.

12. Ònye bu nwoke ahu nke ndu nātọ ya utọ,Nke nāhu ubọchi nile nke ndu n'anya, ka o we hu ọdi-nma?

13. Chezi ire-gi ka ọ ghara ikwu ihe ọjọ,chezi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi ka ha ghara ikwu okwu aghughọ.

14. Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe;Nāchọsi udo ike, b͕aso kwa ya.

Abù Ọma 34