Abù Ọma 34:11-18 Bible Nso (IGBOB)

11. Bianu, umum, gem nti:Egwu Jehova ka m'gēzi unu.

12. Ònye bu nwoke ahu nke ndu nātọ ya utọ,Nke nāhu ubọchi nile nke ndu n'anya, ka o we hu ọdi-nma?

13. Chezi ire-gi ka ọ ghara ikwu ihe ọjọ,chezi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi ka ha ghara ikwu okwu aghughọ.

14. Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe;Nāchọsi udo ike, b͕aso kwa ya.

15. Anya abua nke Jehova di n'aru ndi ezi omume,Nti-Ya abua ghe-kwa-ra oghe na nkpu ha nētiku Ya.

16. Iru Jehova nēmegide ndi nēme ihe ọjọ,Ibipu ncheta-ha n'uwa.

17. Ndi ezi omume tiri nkpu, Jehova we nuru,We si na nkpab͕u-ha nile naputa ha.

18. Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa,Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha.

Abù Ọma 34