1. M'gāgọzi Jehova na mb͕e nile:Mb͕e nile ka otuto-Ya gādi n'ọnum.
2. Jehova ka nkpuru-obim gēji nya isi:Ndi di ume-ala n'obi gānu ya, we ṅuria ọṅu.
3. Sonum me ka Jehova di uku,Ka ayi buli kwa aha-Ya elu n'otù.
4. Achọrọm Jehova, Ọ za-kwa-ram,We naputam n'ujọm nile.
5. Ha legidere Ya anya, we nwue enwu:Ka ihere ghara ime kwa ha n'iru.
6. Onye a ewedara n'ala kpọrọ òkù, Jehova we nuru ya,We si na nkpab͕u-ya nile zọputa ya.
7. Mọ-ozi nke Jehova nāma ulo-ikwū-ya buruburu ndi nātu egwu Ya,Ọ we dọputa ha.
8. Detunu ire, hu na Jehova di nma:Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke nāb͕abà nime Ya.