Abù Ọma 31:3-8 Bible Nso (IGBOB)

3. N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu;Ọzọ, n'ihi aha-Gi I gēdum, dukwam nwayo.

4. I gēme ka m'si n'ub͕u nke ha zoberem puta;N'ihi na Gi onwe-gi bu ebem siri ike.

5. N'aka-Gi ka m'nēnye mọm idebe:I b͕aputawom, Jehova, Chineke nke ezi-okwu.

6. Akpọwom ha asì, bú ndi nāriba ihe-efu nile nke nābughi ihe ama:Ma mu onwem atukwasiwo obi na Jehova.

7. Ka m'tegharia egwú ọṅu, ṅuri kwa ọṅu, n'ebere-Gi:N'ihi na I huwo nweda-n'alam;I mawo nkpuru-obim n'ahuhu di iche iche:

8. I mechibidoghkwam nye n'aka onye-iro;I mewo ka ukwum abua guzo n'ebe sara mbara.

Abù Ọma 31