9. I gēme ha ka ha di ka ite-ọku uku di ọku na mb͕e I ji me ka ha hu iru-Gi:Jehova gēloda ha n'iwe-Ya,Ọku gēripia kwa ha.
10. I gēme ka nkpuru-ha si n'uwa la n'iyì,Umu-ha kwa, site n'etiti umu madu.
11. N'ihi na ha setipuru ihe ọjọ megide Gi:Ha chère ihe-nzube nke ha nāpughi ime.
12. N'ihi na I gēme ka ha b͕akuta azu,I gēji udọ̀-uta-I dozi àkú imegide ha n'iru.