Abù Ọma 21:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, n'ike-Gi ka eze nāṅuri ọṅu;Le kwa otú ọ nēteghari egwú ọṅù nke-uku na nzọputa-Gi!

2. Ọ bu ihe obi-ya nāchọsi ike ka I nyeworo ya,I b͕ochighi kwa arirọ eb͕ub͕ere-ọnu-ya. Selah

3. N'ihi na I ji ngọzi nke ọdi-nma zute ya:I nātukwasi okpu-eze nke ọla-edo anuchara anucha n'isi-ya.

4. Ndu ka Ọ riọrọ n'aka-Gi, I nyewo ya ndu ahu,Bú ubọchi ndu di ogologo rue mb͕e nile ebighi-ebi.

5. Nsọpuru-ya di uku na nzọputa-Gi:Ebube na ima-nma ka I nātukwasi ya.

6. N'ihi na I nēme ya ka ọ buru ngọzi rue mb͕e ebighi-ebi:I nēwere ọṅù me ka ọ ṅuria n'iru Gi.

7. N'ihi na eze nātukwasi Jehova obi,Site kwa n'ebere nke Onye kachasi ihe nile elu agaghi-ewuzuga ya n'ọnọdu-ya.

Abù Ọma 21