Abù Ọma 21:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, n'ike-Gi ka eze nāṅuri ọṅu;Le kwa otú ọ nēteghari egwú ọṅù nke-uku na nzọputa-Gi!

2. Ọ bu ihe obi-ya nāchọsi ike ka I nyeworo ya,I b͕ochighi kwa arirọ eb͕ub͕ere-ọnu-ya. Selah

3. N'ihi na I ji ngọzi nke ọdi-nma zute ya:I nātukwasi okpu-eze nke ọla-edo anuchara anucha n'isi-ya.

4. Ndu ka Ọ riọrọ n'aka-Gi, I nyewo ya ndu ahu,Bú ubọchi ndu di ogologo rue mb͕e nile ebighi-ebi.

5. Nsọpuru-ya di uku na nzọputa-Gi:Ebube na ima-nma ka I nātukwasi ya.

Abù Ọma 21