Abù Ọma 20:5-8 Bible Nso (IGBOB)

5. Ayi gēti nkpu ọṅù na nzọputa-Gi,Ọ bu kwa n'aha Chineke-ayi ka ayi gākwuba ọkọlọtọ-ayi nelu:Jehova mezue aririọ-gi nile.

6. Ub͕u a ka m'maworo na Jehova azọputawo onye nke Ya etere manu;O gēji idi-ike nke nzọputa nke aka-nri-YaZa ya site nelu-igwe-Ya di nsọ.

7. Ufọdu nēhota ub͕o-ala, ndi ọzọ inyinya:Ma ayi onwe-ayi nēhota aha Jehova, bú Chineke-ayi.

8. Ndi ahu eruruwo ala, da kwa ada:Ma ayi onwe-ayi ebiliwo, we guzo onwe-ayi ọtọ.

Abù Ọma 20