Abù Ọma 19:9-13 Bible Nso (IGBOB)

9. Egwu Jehova di ọcha, nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi:Ikpé nile nke Jehova bu ezi-okwu, ha nile ziri ezi n'otù.

10. Ihe anāchọsi ike ka ha bu, kari ọla-edo, e, kari ọtutu ọla-edo anuchara anucha:Ha di kwa utọ kari manu-aṅu bú nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nātasi.

11. Ọzọ, eji ha dọ orù-Gi aka na nti:N'idebe ha ka ọkpukpu-ọlu riri nne nāputa.

12. Nmehie emehieworo n'amaghi-ama, ònye ga-agbaghara ha?Guam n'onye ikpe ihe-nzuzo nile nāmaghi.

13. B͕ochi kwa orù-Gi na nmehie-nganga;Ekwela ka ha nāchim: mb͕e ahu ka m'gēzu okè,Agāgukwam n'onye ikpe njehie riri nne nāmaghi.

Abù Ọma 19