4. Kelenu Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
5. Kelenu Onye ji nghọta eme elu-igwe:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
6. Kelenu Onye meworo ala ka ọ sa mbara n'elu miri:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
7. Kelenu Onye meworo ìhè uku di iche iche:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:
8. Bú anyuanwu ichi n'ehihie:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
9. Na ọnwa na kpakpando ichi n'abali:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
10. Kelenu Onye nētib͕u Ijipt nime umu-ha eburu uzọ mu:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: