Abù Ọma 136:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

2. Kelenu Chineke kachasi chi nile:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

3. Kelenu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

4. Kelenu Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

5. Kelenu Onye ji nghọta eme elu-igwe:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

6. Kelenu Onye meworo ala ka ọ sa mbara n'elu miri:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

7. Kelenu Onye meworo ìhè uku di iche iche:N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:

Abù Ọma 136