Abù Ọma 132:11-17 Bible Nso (IGBOB)

11. Jehova aṅuworo Devid iyi bu ezi-okwu;Ọ gaghi-esi na ya laghachi azu:Ndi sitere na nkpuru nke afọ-gi ka M'gādọkwasi n'oche-eze i nwere.

12. Ọ buru na umu-gi edebe ọb͕ub͕a-ndumNa ihe-àmàm nke M'gēzí ha,Umu-ha gānọkwasi kwa n'oche-eze i nwere rue mb͕e nile ebighi-ebi.

13. N'ihi na Jehova arọputawo Zaion;Ọ chọsiwo ya ike iburu Ya ebe-obibi.

14. Nka bu ebe-izu-ikem rue mb͕e nile ebighi-ebi:N'ebe a ka M'gēbi; n'ihi na achọsiwom ya ike.

15. Ihe-oriri-ya ka M'gāgọzi nke-uku:Ndi-ob͕eye-ya bu ndi M'gēji nri me ka afọ ju ha.

16. Ọ bu kwa ndi-nchu-àjà-ya ka M'gēyikwasi nzọputa dika uwe:Ndi-ebere-ya gētisi kwa nkpu ọṅù ike.

17. N'ebe ahu ka M'gēme ka mpi Devid nwere pue:Edoworom onye nkem etere manu oriọna n'usoro.

Abù Ọma 132