Abù Ọma 104:21-29 Bible Nso (IGBOB)

21. Umu-ọdum nāb͕ọ uja na-achọ anu ha gādọb͕u,N'ichọ kwa ihe-oriri-ha n'aka Chineke.

22. Anyanwu nāwa, ha we chikọta onwe-ha,We mākpuru n'ebe-obibi-ha di iche iche.

23. Madu nāpu ga ọlu-yaGa kwa ọlu-ubi-ya rue anyasi.

24. Le ka ọlu-Gi si ba uba nke-uku, Jehova!N'amam-ihe ka I meworo ha nile:Uwa juputara n'ihe I nwetara.

25. Oké osimiri ka nka bu, nke di uku, nke sa-kwa-ra mbara n'aka abua,Ebe ihe nākpu akpu di nke nādighi ọnu-ọgugu,Anu di iche iche, ma anu ntà ma anu uku.

26. N'ebe ahu ka ub͕ọ nile nāga;Leviatham kwa, nke I kpuworo igwuri egwú nime ya.

27. Ha nile nēle anya Gi,Inye ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.

28. I nēnye ha, ha achikọta ya;I nāsaghe aka-Gi, afọ ezi ihe eju ha.

29. I nēzobe iru-Gi, ha ama jijiji;I nāchikọta mọ-ha, ha ekubìe ume,We laghachi n'ájá-ha.

Abù Ọma 104