1. Ebere na ezi ikpé ka M'gābù n'abù:Gi, Jehova, ka m'gabùku abù ọma.
2. M'gēnwe uche n'uzọ zuru okè:Òle mb͕e I gābiakutem?M'gējeghari n'etiti ulom n'izu-okè nke obim.
3. M'gaghi-edo ihe jọb͕uru onwe-ya n'irum:Akpọwom ọlu nke ndi nējehie asì;Ọ gaghi-arapra n'arum.
4. Obi b͕agọro ab͕agọ gēsi n'ebe m'nọ wezuga onwe-ya:Ọ dighi onye ọjọ m'gāmara.
5. Onye nēkpè madu-ibe-ya ikpè na nzuzo, onye ahu ka m'gēkpochapu:Onye nwere anya npako na obi di nganga, onye ahu ka m'nāpughi inagide.