9. Ọ neche anwu n'ebe-nzuzo dika ọdum n'okwu-ọhia-ya:Ọ nēche anwu inwude onye ewedara n'ala:Ọ na-anwude onye ewedara n'ala, mb͕e ọ dọbatara ya n'ub͕u-ya.
10. Anāzọpia ya, ọ nāmakpu amakpu,Ndi nāhuju anya adawo kwa n'ala site n'aka ndi-ya nwere ume.
11. Ọ siwo n'obi-ya, Chineke echezọwo:O zobewo iru-Ya; ọ dighi mb͕e Ọ huru ya.
12. Bilie, Jehova; Chineke, welie aka-Gi elu:Echezọla ndi ewedara n'ala.