Abù-Ákwá 4:6-16 Bible Nso (IGBOB)

6. Ajọ omume nke ada ndim we di uku kari nmehie Sọdọm,Nke akwaturu dika n'otù ntabi-anya, ma ọ dighi aka ọ bula dakwasiri ya.

7. Ndi-Nazirait-ya di ọcha kari snow, ha nwuru enwu kari miri-ara-ehi,Ha chara ọbara-ọbara n'aru kari ruby, dika sapphire ka udi-ha di.

8. Udi-aru-ha ab͕awo ọchichiri kari iji-nji; amataghi ha n'èzí:Akpukpọ-ha araparawo n'ọkpukpu-ha; ọ kpọnwuwo, ọ ghọwo ihe di ka osisi.

9. Ndi mma-agha b͕uworo adiwo nma kari ndi agu gub͕uworo;N'ihi na ndia nērùpu dika miri, buru ndi adupuworo adupú, ghara inwe ihe-omume nke ubi.

10. Aka ndinyom ndi nwere obi-ebere esiwo umu-ha n'ite;Ha aghọworo ha ihe-oriri na ntipia nke ada ndim.

11. Jehova emezuwo ọmuma-Ya, Ọ wupuwo iwe-Ya di ọku;O we suye ọku nime Zaion, o we ripia ntọ-ala-ya nile.

12. Ndi-eze uwa ekweghi, ndi nile bi n'elu-uwa dum madu bi ekweghi kwa,Na onye-nkpab͕u na onye-iro gābà n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem.

13. O sitere na nmehie nile nke ndi-amuma-ya, na ajọ omume nile nke ndi-nchu-àjà-ya,Ndi nāwusi ọbara ndi ezi omume n'etiti ya.

14. Ha aṅaghariwo dika ndi-ìsì n'èzí nile, ejiwo ọbara meru ha,Madu we ghara inwe ike imetu uwe-ha aka.

15. Wezuganu onwe-unu, ka ha kpọrọ ha òkù, Onye ruru árú! wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, unu emetula aka:Mb͕e ha b͕apuru ha ṅaghari-kwa-ra; madu siri n'etiti mba nile, Ha agaghi-anọ kwa ọnọdu-abali ọzọ n'ebe a.

16. Iru Jehova ekesawo ha; Ọ gaghi-elegide kwa ha anya ọzọ:Madu ahughi ndi-nchu-àjà iru-ọma, ha emeghi ndi-okenye amara.

Abù-Ákwá 4