Abù-Ákwá 3:48-58 Bible Nso (IGBOB)

48. Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim.

49. Anyam nāwusi dika miri, ọ dighi-eguzo kwa du, ghara ikwusi akwusi,

50. Rue mb͕e Jehova gēsi n'elu-igwe lepu anya, hu.

51. Anyam nēme nkpuru-obim ihe, n'ihi umu-ndinyom nile nke obodom.

52. Ndi bu ndi-irom n'efu achusiwo ntám ike dika nnunu.

53. Ha ekpochapuwo ndum n'olùlù, we tuam nkume.

54. Miri rubigaram n'isi; asirim, Ebipuwom.

55. Esirim n'olùlù dichasi ala kpọkue aha-Gi, Jehova.

56. Olum ka I nuru; ezobela nti-Gi n'iku-umem, na ntikum.

57. I biaruru nso n'ubọchi m'kpọkuru Gi: I siri, Atula egwu.

58. Onye-nwe-ayi, I kpezuwo ọnu nke nkpuru-obim; I b͕aputawo ndum.

Abù-Ákwá 3