48. Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim.
49. Anyam nāwusi dika miri, ọ dighi-eguzo kwa du, ghara ikwusi akwusi,
50. Rue mb͕e Jehova gēsi n'elu-igwe lepu anya, hu.
51. Anyam nēme nkpuru-obim ihe, n'ihi umu-ndinyom nile nke obodom.
52. Ndi bu ndi-irom n'efu achusiwo ntám ike dika nnunu.