Abù-Ákwá 3:39-52 Bible Nso (IGBOB)

39. Gini mere madu nke di ndu ji atamu ntamu, onye ọ bula, bayere ahuhu nmehie-ya nile?

40. Ka ayi gwuputa ala uzọ nile ayi, nyochaputa ha, laghachikuru Jehova.

41. Ka ayi weliere Chineke Nke bi n'elu-igwe obi-ayi n'ọbu-aka-ayi abua.

42. Ayi onwe-ayi ejehiewo nupu kwa isi; Gi onwe-gi ab͕agharaghi.

43. I werewo iwe kpuchie Onwe-gi, we chua ayi; I b͕uwo, I nweghi ọmiko.

44. I werewo igwe-oji kpuchie Onwe-gi, ka ekpere-ayi we ghara igabiga.

45. Ihe azachapuru azachapu na ihe ajuru aju ka I nēme ayi n'etiti ndi nile di iche iche.

46. Ndi-iro-ayi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide ayi.

47. Oké egwu na olùlù eruwo ayi aru, itọb͕ọ-n'efu na ntipia.

48. Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim.

49. Anyam nāwusi dika miri, ọ dighi-eguzo kwa du, ghara ikwusi akwusi,

50. Rue mb͕e Jehova gēsi n'elu-igwe lepu anya, hu.

51. Anyam nēme nkpuru-obim ihe, n'ihi umu-ndinyom nile nke obodom.

52. Ndi bu ndi-irom n'efu achusiwo ntám ike dika nnunu.

Abù-Ákwá 3