29. Ya tiye ọnu-ya n'ájá; ma eleghi anya ọ di olile-anya gādi.
30. Ya mere ǹtì-ya nye onye nēti ya ihe; ka ita-uta ju ya afọ.
31. N'ihi na Onye-nwe-ayi agaghi-aju rue mb͕e ebighi-ebi.
32. N'ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.
33. N'ihi na Ọ dighi-esite n'obi-Ya weda umu madu n'ala, mekpa ha aru.
34. Izọpia ndi-nkpọrọ nile nke uwa n'okpuru ukwu,
35. Iwezuga ikpé ọ bula n'iru Onye kachasi ihe nile elu,
36. Ime ka madu b͕agọ ab͕agọ n'okwu-ikpé-ya: Onye-nwe-ayi eleghi ihe ndia anya ọma.
37. Ònye bu onye ahu nke kwuworo okwu, o we rè, mgbe onyenwe-ayi enyeghi iwu?
38. Ọ̀ bughi n'ọnu Onye kachasi ihe nile ka ihe ọjọ na ezi ihe si aputa?
39. Gini mere madu nke di ndu ji atamu ntamu, onye ọ bula, bayere ahuhu nmehie-ya nile?
40. Ka ayi gwuputa ala uzọ nile ayi, nyochaputa ha, laghachikuru Jehova.
41. Ka ayi weliere Chineke Nke bi n'elu-igwe obi-ayi n'ọbu-aka-ayi abua.
42. Ayi onwe-ayi ejehiewo nupu kwa isi; Gi onwe-gi ab͕agharaghi.