24. Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya.
25. Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ.
26. Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya.
27. Ọ diri nwoke nma ka ọ nēbu yoke na mb͕e ọ di na nwata.
28. Ya nọdu náni ya iche, debe ọnu-ya du, n'ihi na Ọ tukwasiwo ya n'olu-ya.