10. M'gēdo-kwa-ra ndim, bú Israel, otú ebe, ku kwa ha dika osisi, ka ha we biri n'ọnọdu-ha, ghara ima jijiji ọzọ; umu ajọ omume agaghi-eweda kwa ha ọzọ, dika na mbu,
11. na dika site n'ubọchi mb͕e M'nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel; emewokwam ka i zuru ike pua n'aka ndi-iro-gi nile. Jehova egosiwo kwa gi na Jehova gēmere gi ulo.
12. Mb͕e ubọchi-gi zuru, mb͕e gi gēsoro nna-gi-hà dina kwa n'ọnwu, M'gēme kwa ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, nke gēsi n'afọ-gi puta, M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike.
13. Onye ahu gēwuru aham ulo, M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi.
14. Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe ya gābu-kwa-ram nwa: ọ buru na ọ me ajọ omume, M'gēwere nkpa-n'aka madu, were kwa ihe-otiti nke umu madu, dua ya ọdu;
15. ma eberem agaghi-esi n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya, dika M'wēzugara ya n'ebe Sọl nọ, onye M'wezugara n'iru gi.
16. Ma ulo-gi na ala-eze-gi gēkwesi ntukwasi-obi n'iru gi rue mb͕e ebighi-ebi: agēme ka oche-eze-gi buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi.
17. Dika okwu ndia nile si di, na dika ọhù a nile si di, otú a ka Netan gwara Devid okwu.
18. Eze, bú Devid, we ba, nọdu ala n'iru Jehova; ọ si, Ònye ka m'bu, Onye-nwe-ayi Jehova, gini kwa ka ulom bu, na I mewo ka m'biarue na mb͕e a?
19. Ma nka bu nání ihe ntà n'anya-Gi, Onye-nwe-ayi Jehova; I we kwu kwa okwu bayere ulo-orú-Gi rue mb͕e di anya; nka bu kwa iwu bayere madu, Onye-nwe-ayi Jehova!
20. Ma gini ka Devid gāgwa kwa Gi ọzọ? n'ihi na Gi onwe-gi mara orù-Gi, Onye-nwe-ayi Jehova.
21. N'ihi okwughi, na dika obi-Gi si di, ka I meworo ihe-idi-uku a nile, ime ka orù-Gi mara ya.
22. N'ihi nka I di uku, Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ọ dighi onye di ka Gi, ọ dighi kwa Chineke ma-ọbughi Gi, dika ihe nile si di nke ayi nuworo na nti-ayi.
23. Ma òle mba di ka ndi-Gi, dika Israel, bú otù mba nke nēguzo iche n'uwa, nke Chineke jere ib͕aputara Onwe-ya ka ọ buru otù ndi, na imere Onwe-ya aha, na imere unu ihe-idi-uku a, na imere ala-Gi ihe di egwu, n'iru ndi-Gi, nke I siri n'Ijipt, bú mba di iche iche ọzọ na chi nile ha, baputara onwe-gi?
24. I we me ndi-Gi, bú Israel, ka o guzosiere Gi ike, iburu Gi otù ndi rue mb͕e ebighi-ebi; Gi onwe-gi, Jehova, we ghọrọ ha Chineke.
25. Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke, okwu ahu nke I kwuworo bayere orù-Gi, baye-kwa-ra ulo-ya, me ya ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, Gi me kwa dika I kwuworo.
26. Ka aha-Gi di kwa uku rue mb͕e ebighi-ebi, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu Chineke Israel: agēme kwa ka ulo orù-Gi, bú Devid, guzosie ike n'iru Gi.
27. N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, I kpughewo nti orù-Gi, si, M'gēwu-kwa-ra gi ulo: n'ihi nka orù-Gi nwetara obi-ike ikpere Gi ekpere a.
28. Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi Jehova, Gi onwe-gi bu Chineke onwe-ya, okwu-Gi nile bu kwa ezi-okwu, I gwawo kwa orù-Gi ezi ihe a: