10. M'gēdo-kwa-ra ndim, bú Israel, otú ebe, ku kwa ha dika osisi, ka ha we biri n'ọnọdu-ha, ghara ima jijiji ọzọ; umu ajọ omume agaghi-eweda kwa ha ọzọ, dika na mbu,
11. na dika site n'ubọchi mb͕e M'nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel; emewokwam ka i zuru ike pua n'aka ndi-iro-gi nile. Jehova egosiwo kwa gi na Jehova gēmere gi ulo.
12. Mb͕e ubọchi-gi zuru, mb͕e gi gēsoro nna-gi-hà dina kwa n'ọnwu, M'gēme kwa ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, nke gēsi n'afọ-gi puta, M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike.
13. Onye ahu gēwuru aham ulo, M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi.
14. Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe ya gābu-kwa-ram nwa: ọ buru na ọ me ajọ omume, M'gēwere nkpa-n'aka madu, were kwa ihe-otiti nke umu madu, dua ya ọdu;
15. ma eberem agaghi-esi n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya, dika M'wēzugara ya n'ebe Sọl nọ, onye M'wezugara n'iru gi.